ABSTRACT

The prerequisite for a standard social work practice agency for students’ field practicum in the Nigerian social work pedagogy is that it should be staffed by trained social workers who will adequately play the role of field supervisors to guide students on field practicum. However, it appears that this critical aspect of social work pedagogy is being harmed by lack of standard social work practice agencies and skilled agency supervisors. Information for this chapter was obtained largely through key informant interviews with four social work educators and focus group discussions with 20 undergraduate social work students. Participants' lived experiences revealed current realities and challenges with fieldwork placement within the Nigerian social work educational system. A revelatory theme that emerged from the study, however, suggests innovative strategies for a sustainable social work education in Nigeria. We recommend provision of Nigerian-based fieldwork instructional guides and periodic retraining of social work educators.

Ihe dị mkpa maka ezi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọzụzụ nnwale ụmụ akwụkwọ amụmamụ mwulite obodo na nkụzi na ọmụmụ amụmamụ mwulite obodo na Naịjirịa bụ na ọ ga-abụ nke nwere ndị a zụrụ nke ọma n’amụmamụ mwulite obodo, bụ ndị ga-arụ ọrụ ndị nlekọta iji duzie ụmụ akwụkwọ na-agabiga ọzụzụ nnwale. Ka ọ sila dị, ọ dị ka ihe mmekpa ahụ mpaghara a dị mkpa na nkụzi na ọmụmụ amụmamụ mwulite obodo bụ ụkọ ezi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọrụ amụmamụ mwulite obodo na ndị nlekọta ma ihe ekwe na-akụ. Ozi e jiri hazie isi nke a sitekarịrị n’ajụjụ ọnụ a gbara ndị e sitere n’aka ha nweta ọkpụrụkpụ ozi bụ́ ndị nkụzi amụmamụ mwulite obodo mmadụ anọ na otu mkparịta ụka ajụjụ ọnụ ụmụ akwụkwọ nọ n’amụmamụ mwulite obodo mmadụ iri abụọ. Ihe ndị so n’ọrụ nchọcha a gabigara n’onwe ha mere ka a hụta ọnọdụ na ihe ịma aka n’ihu dịịrị iziga ọzụzụ nnwale n’usoro agụmakwụkwọ amụmamụ mwulite obodo na Naịjirịa ugbu a. Ka o sila dị, nchọpụta nchọcha a mere ka a hụta usoro ọhụrụ ndị ga-eme ka nkụzi na ọmụmụ amụmamụ mwulite obodo guzosie ike na Naịjirịa. Anyị na-atụnye aro ka e nwee akwụkwọ nduzi maka ime ọzụzụ nnwale nke gbadoro ụkwụ na Naịjirịa na ọzụzụ ndị nkụzi amụmamụ mwulite obodo kwa mgbe kwa mgbe.